Isaiah 53

1Onye kweere ozi anyị,
ọ bụkwa nʼahụ onye ka e kpugheere ogwe aka Onyenwe anyị?
2Nʼihi na o tolitere nʼihu Onyenwe anyị dịka ome,
dịka mgbọrọgwụ nke puputara nʼala kpọrọ nkụ.
O nweghị ụdịdị ọma maọbụ ịma mma nke ga-eme ka anyị lee ya anya.
O nweghị ihe ọbụla dị nʼụdịdị ya nke ga-eme ka ihe banyere ya masị anyị, maọbụ mee ka anyị chọsie ya ike.
3Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya.
Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ.
Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ.
E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.

4Nʼezie, ihe mgbu niile anyị ka o buuru,
burukwa ahụhụ nke ọrịa anyị niile,
ma anyị gụrụ ya ka onye Chineke tara ahụhụ,
onye o tiri ihe otiti, na onye o mekpara ahụ.
5Ma e tipụrụ ya ọnya nʼihi mmehie anyị:
ọ bụkwa nʼihi ajọ omume anyị ka e ji merụchaa ya ahụ.
E mere ka anyị nwee udo nʼihi ahụhụ ọ hụrụ;
ọ bụkwa ubiri ụtarị dị ya nʼahụ mere anyị ji bụrụ ndị ahụ dị ike.
6Anyị niile akpafuola dịka igwe atụrụ;
onye ọbụla nʼime anyị etinyela isi ya nʼụzọ nke aka ya.
Ma Onyenwe anyị ebokwasịla ya
ajọ omume anyị niile.

7A kpagburu ya, mesie ya ihe ike,
ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta.
E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị,
otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.
8Site na mmegbu na ikpe ka e ji wepụ ya.
Ma, onye nʼetiti ndị ọgbọ
Ya bụ, kwụpụtara
ya weliri olu kwuo okwu?
Nʼihi na e bipụrụ ya site nʼala ndị dị ndụ;
maka njehie ndị m ka e ji tie ya ihe.
Ya bụ, taa ya ahụhụ

9E nyefere ya ka e lie ya dịka onye na-emebi iwu,
ọ bụkwa nʼetiti ndị ọgaranya ka e liri ya,
ọ bụ ezie na o nweghị ihe ọjọọ ọbụla o mere,
ọ dịkwaghị okwu aghụghọ si nʼọnụ ya pụta.

10Ma ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị ịzọpịa ya, na ime ka ọ taa ahụhụ.
Nʼihi na ọnwụ ya bụ aja a chụrụ nʼihi ikpe ọmụma nke mmehie.
Ọ ga-ahụ ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ ya; ọ ga-adịkwa ndụ ogologo oge.
Nzube Chineke niile ga-emezukwa site na ya.
11Mgbe ọ hụsịrị ahụhụ,
ọ ga-emesịa hụ ìhè nke ndụ, afọ ga-ejukwa ya,
site nʼihe ọmụma ya, ka onye ezi omume ahụ, bụ ohu m ga-eme ka a gụọ ọtụtụ mmadụ dịka ndị ezi omume,
ọ ga-ebukwa mmehie ha niile.
12Nʼihi ya, aga m enye ya oke nʼetiti ndị bara ụba,
Maọbụ, ndị dị ike

ọ ga-esokwa ndị bụ dike keta ihe nkwata nʼagha,
nʼihi na ọ wụpụrụ ndụ ya nye ọnwụ,
a gụkọtara ya na ndị na-emebi iwu.
Ma ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ mmadụ,
rịọọkwara ndị na-emebi iwu arịrịọ.
Copyright information for IboBIU